4Achọpụtakwara m na ihe mere ndị mmadụ ji na-adọgbu onwe ha nʼọrụ bụ nʼihi anya ụfụ ha nwere nʼebe ihe ndị agbataobi ha dị. Nke a bụ ihe efu, ịchụso ifufe.
5Onye nzuzu na-afanye aka abụọ nʼapata, na-eri anụ ahụ onwe ya.
6Ọ ka mma inwe ihe ntakịrị na obi udo, karịa mmadụ inweju akụ site nʼịdọgbu onwe ya nʼọrụ, nke bụ naanị ịchụso ifufe.
7Ọ dịkwa ihe ọzọ m hụrụ nʼokpuru anyanwụ bụ naanị ihe efu.
8Ọ dị otu nwoke nke naanị ya nọ, o nweghị nwa, o nwekwaghị ụmụnne. Mgbe niile, ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ, ma nke a emeghị ka afọ ju ya nʼakụnụba o nwere. Ọ jụrụ sị, “Ọ bụ nʼihi onye ka m ji adọgbu onwe m nʼọrụ,” “nʼihi gịnị ka m ji anapụ onwe m ihe obi aṅụrị?” Ihe nke a enweghị isi, ihe efu na-eweta obi mgbawa ka ha bụ.