Ekiliziastis 4

Onye nzuzu na-afanye aka abụọ nʼapata, na-eri anụ ahụ onwe ya.

Ecclesiastes 4:5 (UKJV) The fool folds his hands together, and eats his own flesh.

3Ma ọ dị mma karịa ha abụọ bụ onye ahụ a na-amụbeghị, onye na-ahụbeghị ihe ọjọọ nke dị nʼokpuru anyanwụ.

4Achọpụtakwara m na ihe mere ndị mmadụ ji na-adọgbu onwe ha nʼọrụ bụ nʼihi anya ụfụ ha nwere nʼebe ihe ndị agbataobi ha dị. Nke a bụ ihe efu, ịchụso ifufe.

5Onye nzuzu na-afanye aka abụọ nʼapata, na-eri anụ ahụ onwe ya.

6Ọ ka mma inwe ihe ntakịrị na obi udo, karịa mmadụ inweju akụ site nʼịdọgbu onwe ya nʼọrụ, nke bụ naanị ịchụso ifufe.

7Ọ dịkwa ihe ọzọ m hụrụ nʼokpuru anyanwụ bụ naanị ihe efu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.