9Mgbe ihe nnweta si nʼala ubi bara ụba, ọ na-abara onye ọbụla uru; ọ na-abakwara eze nʼonwe ya uru.
10Onye ọbụla hụrụ ego nʼanya, ọ gaghị eju ya afọ. Onye ọbụla hụrụ akụnụba nʼanya adịghị enwe afọ ojuju nʼihe ọbụla. Nke a bụkwa ihe efu.
11Akụ na-abawanye, ndị na-eri ya na-abawanyekwa. Olee uru ha bara nye onyenwe ha karịa iji anya ya abụọ na-ele ha?
12Onye na-arụsị ọrụ ike na-arahụ ụra nke ọma, ma o riri nri nta ma o rikwaranụ nke dị ukwuu, ma oke iriju afọ onye ọgaranya anaghị ekwe ya rahụ ụra.
13Ahụrụ m ihe ọjọọ ọzọ nʼokpuru anyanwụ, mmadụ debere akụnụba ruo mgbe o wetara ya ihe mgbu,