12Onye na-arụsị ọrụ ike na-arahụ ụra nke ọma, ma o riri nri nta ma o rikwaranụ nke dị ukwuu, ma oke iriju afọ onye ọgaranya anaghị ekwe ya rahụ ụra.
13Ahụrụ m ihe ọjọọ ọzọ nʼokpuru anyanwụ, mmadụ debere akụnụba ruo mgbe o wetara ya ihe mgbu,
14ma akụnụba ndị ahụ bụ ihe furu site nʼọdachi nke bụ na mgbe ha mụtara ụmụ, o nwekwaghị ihe fọdụrụ ụmụ ahụ iketa.
15Dịka mmadụ si gbara ọtọ site nʼafọ nne ya bata nʼụwa, otu a ka anyị ga-esi hapụ ya. O nweghị ihe ọ ga-ebu pụọ site na ndọgbu niile ọ dọgburu onwe ya nʼọrụ.
16Ma nke a bụ ihe ọjọọ nke na-egbu mgbu nʼobi. Mmadụ na-ala dịka o siri bịa. Gịnị bụ uru ya, mgbe ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nye ifufe?