10Asịla, “Gịnị mere ụbọchị gara aga ji dị mma karịa ụbọchị ndị a?” Nʼihi na ọ bụghị amamihe ị jụ ajụjụ dị otu a.
11Amamihe dịka ihe nketa, bụ ihe dị mma. Ọ na-abara uru nye ndị na-ahụ anyanwụ anya.
12Amamihe bụ ndo dịka ego si bụrụkwa ndo, ma ụzọ ihe ọmụma ji dị mma karịa bụ nke a: Amamihe na-echebe ndụ ndị nwere ya.
13Chee echiche banyere ihe Chineke na-eme. Mmadụ ọ pụrụ ime ka ọ dịzie adịzie, bụ ihe Chineke mere ka ọ gbagọọ agbagọ?
14Mgbe ihe na-agara gị nke ọma, ṅụrịa ọṅụ, nʼihi ọ dịrị gị mma, ma mgbe mmekpa ahụ batara, mata nke ọma na Chineke onye na-enye ọnọdụ ọma makwa ihe banyere ọnọdụ ọjọọ. Ya mere, o nweghị onye ọbụla nwere ike ịchọpụta ọdịnihu ya.