13Chee echiche banyere ihe Chineke na-eme. Mmadụ ọ pụrụ ime ka ọ dịzie adịzie, bụ ihe Chineke mere ka ọ gbagọọ agbagọ?
14Mgbe ihe na-agara gị nke ọma, ṅụrịa ọṅụ, nʼihi ọ dịrị gị mma, ma mgbe mmekpa ahụ batara, mata nke ọma na Chineke onye na-enye ọnọdụ ọma makwa ihe banyere ọnọdụ ọjọọ. Ya mere, o nweghị onye ọbụla nwere ike ịchọpụta ọdịnihu ya.
15Ndụ m nʼụwa a bụ ihe efu, ahụla m ihe abụọ ndị a; onye ezi omume na-anwụ nʼezi omume ya, ma onye na-emebi iwu na-ebi ogologo ndụ na mmebi iwu ya.
16Nʼihi ya, abụbigala onye ezi omume oke, emekwala onwe gị onye mabigara ihe oke. Gịnị mere i ji achọ igbu onwe gị?
17Abụbigala onye na-emefe ajọ omume oke, abụkwala onye nzuzu! Gịnị ka ị ga-eji nwụọ mgbe oge gị na-erubeghị?