Ekiliziastis 7

Gbaa ụwa niile gburugburu, ọ dịghị otu onye bụ onye ezi omume, ọ dịghị onye na-eme ihe ziri ezi nke na-adịghị eme mmehie mgbe ọbụla.

Ecclesiastes 7:20 (UKJV) For there is not a just man upon earth, that does good, and sins not.

18Ọ dị mma ijide otu na-esepụghị aka na nke ọzọ, onye na-atụ egwu Chineke ga-enweta uru nʼime ha abụọ.

19Amamihe na-eme ka otu onye dị ike karịa mmadụ iri na-achị otu obodo.

20Gbaa ụwa niile gburugburu, ọ dịghị otu onye bụ onye ezi omume, ọ dịghị onye na-eme ihe ziri ezi nke na-adịghị eme mmehie mgbe ọbụla.

21Egela ntị nʼihe niile ndị mmadụ na-ekwu, ị pụrụ ịnụ nkọcha nke ohu gị na-akọcha gị.

22Gị onwe gị maara na ọtụtụ oge, ị na-akọchakwa ndị ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.