20Gbaa ụwa niile gburugburu, ọ dịghị otu onye bụ onye ezi omume, ọ dịghị onye na-eme ihe ziri ezi nke na-adịghị eme mmehie mgbe ọbụla.
21Egela ntị nʼihe niile ndị mmadụ na-ekwu, ị pụrụ ịnụ nkọcha nke ohu gị na-akọcha gị.
22Gị onwe gị maara na ọtụtụ oge, ị na-akọchakwa ndị ọzọ.
23Agbalịsiela m ike inwe nghọta. Ekwuru m sị, “Aga m abụ onye amamihe,” ma nke a karịrị m.
24Amamihe adịghị mfe inweta, ọ dị omimi nke ukwuu; ọ bụ onye pụrụ ịchọpụta ya?