22Gị onwe gị maara na ọtụtụ oge, ị na-akọchakwa ndị ọzọ.
23Agbalịsiela m ike inwe nghọta. Ekwuru m sị, “Aga m abụ onye amamihe,” ma nke a karịrị m.
24Amamihe adịghị mfe inweta, ọ dị omimi nke ukwuu; ọ bụ onye pụrụ ịchọpụta ya?
25A tụgharịrị uche m ka m ghọta, iledo na ịchọpụta amamihe na atụmatụ otu ihe niile si dị na ịghọtakwa nzuzu nke dị na ajọ omume na ịyị ara nke dị na enweghị uche.
26Achọpụtara m na ọ dị ihe dị ilu karịa ọnwụ, ihe ahụ bụ nwanyị. Obi ya dị ka ụgbụ. Otu a kwa, aka o ji ejikụ gị dị ka ụdọ igwe. Onye ahụ na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ na-esi nʼaka ya gbapụ, ma ndị mmehie ka ọ na-enwude nʼọnya ya.