Ekiliziastis 7

“Lee, Ihe a ka m chọpụtara,” ka onye nkuzi kwuru: “Site nʼịtụkwasị otu ihe nʼelu ibe ya ka m matara isi ihe niile.

Ecclesiastes 7:27 (UKJV) Behold, this have I found, says the preacher, counting one by one, to find out the account:

25A tụgharịrị uche m ka m ghọta, iledo na ịchọpụta amamihe na atụmatụ otu ihe niile si dị na ịghọtakwa nzuzu nke dị na ajọ omume na ịyị ara nke dị na enweghị uche.

26Achọpụtara m na ọ dị ihe dị ilu karịa ọnwụ, ihe ahụ bụ nwanyị. Obi ya dị ka ụgbụ. Otu a kwa, aka o ji ejikụ gị dị ka ụdọ igwe. Onye ahụ na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ na-esi nʼaka ya gbapụ, ma ndị mmehie ka ọ na-enwude nʼọnya ya.

27“Lee, Ihe a ka m chọpụtara,” ka onye nkuzi kwuru: “Site nʼịtụkwasị otu ihe nʼelu ibe ya ka m matara isi ihe niile.

28Mgbe m ka na-achọ ma achọtaghị m, nʼetiti puku mmadụ ndị ikom, achọtara m otu onye aka ya dị ọcha, ma ọ dịghị otu nwanyị m chọtara nʼetiti ha.

29Achọpụtara m naanị nke a, Chineke mere ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị ụzọ ha ziri ezi, ma ha atụgharịala chọrọ ọtụtụ ihe nchepụta gawa.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.