1Ezi aha ka mma karịa mmanụ isi ụtọ. Ụbọchị mmadụ nwụrụ ka ụbọchị a mụrụ ya mma.
2Ọ kaara gị mma ije nʼebe a na-eru ụjụ karịa ebe a na-eri na-aṅụ. Nʼihi na ọnwụ dịịrị mmadụ ọbụla; ndị dị ndụ kwesiri iburu nke a nʼobi.
3Iru ụjụ ka ịchị ọchị mma, ihu gbarụrụ agbarụ na-enyere obi aka
4Onye maara ihe na-eche echiche banyere ọnwụ, ma onye nzuzu na-eche naanị banyere ikpori ndụ.
5Ọ ka mma ige ntị nye mba onye maara ihe karịa ịṅa ntị nʼabụ ndị na-enweghị uche na-abụ.