Ekiliziastis 7

Ọ ka mma ige ntị nye mba onye maara ihe karịa ịṅa ntị nʼabụ ndị na-enweghị uche na-abụ.

Ecclesiastes 7:5 (UKJV) It is better to hear the rebuke of the wise, than for a man to hear the song of fools.

3Iru ụjụ ka ịchị ọchị mma, ihu gbarụrụ agbarụ na-enyere obi aka

4Onye maara ihe na-eche echiche banyere ọnwụ, ma onye nzuzu na-eche naanị banyere ikpori ndụ.

5Ọ ka mma ige ntị nye mba onye maara ihe karịa ịṅa ntị nʼabụ ndị na-enweghị uche na-abụ.

6Ọchị onye nzuzu dị ka mkpọtụ nke ogwu na-ere ọkụ na-eme nʼokpuru ite. Ihe a bụkwa ihe efu.

7Iji anya ike nara mmadụ ihe na-eme ka onye mara ihe ghọọ onye nzuzu, iri ngarị na-emerụ obi mmadụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.