7Iji anya ike nara mmadụ ihe na-eme ka onye mara ihe ghọọ onye nzuzu, iri ngarị na-emerụ obi mmadụ.
8Ọgwụgwụ ihe ọbụla dị mma karịa mmalite ya! Ogologo ntachiobi dị mma karịa mpako!
9Abụla onye na-ewe iwe ọsịịsọ, nʼihi na iwe bụ oke ndị nzuzu.
10Asịla, “Gịnị mere ụbọchị gara aga ji dị mma karịa ụbọchị ndị a?” Nʼihi na ọ bụghị amamihe ị jụ ajụjụ dị otu a.
11Amamihe dịka ihe nketa, bụ ihe dị mma. Ọ na-abara uru nye ndị na-ahụ anyanwụ anya.