1Onye dị ka onye amamihe? Onye maara nkọwa ihe? Amamihe na-enyekwa ihu ya ihe, na-emekwa ka mgbarụ nke ihu ya gbanwee.
2Asị m, debe iwu eze, nʼihi iyi ị ṅụrụ nʼihu Chineke.
3Emela ngwangwa isi nʼihu eze pụọ. Akwagidela ihe ọjọọ nʼihi na ọ ga-eme ihe masịrị ya.
4Nʼihi na okwu eze nwere ike ọ dịghị onye pụrụ ịjụ ya, Gịnị ka ị na-eme?