2Asị m, debe iwu eze, nʼihi iyi ị ṅụrụ nʼihu Chineke.
3Emela ngwangwa isi nʼihu eze pụọ. Akwagidela ihe ọjọọ nʼihi na ọ ga-eme ihe masịrị ya.
4Nʼihi na okwu eze nwere ike ọ dịghị onye pụrụ ịjụ ya, Gịnị ka ị na-eme?
5Onye na-edebe iwu eze agaghị adaba na nsogbu. Onye maara ihe na-ama mgbe kwesiri na ụzọ kwesiri ime ihe.
6Ihe niile nwere oge kwesiri ya, ụzọ e si eme ha dịkwa, ọ bụ ezie na nsogbu mmadụ dị ukwuu nʼahụ ya.