Ndị Efesọs 2

Nʼihi na ya onwe ya bụ udo anyị, o mere ka ụzọ otu abụọ bụrụ otu ihe nʼime ahụ ya, site na ịkwatu mgbidi kewara ha na mgbe ochie, bụ mgbidi nke ịkpọ asị dị nʼetiti anyị.

Ephesians 2:14 (UKJV) For he is our peace, who has made both one, and has broken down the middle wall of partition between us;

12Nʼoge ahụ, ọ dịghị ihe jikọtara unu na Kraịst. E kewapụtara unu site na mmekọrịta nke Izrel, bụrụkwa ndị ọbịa nʼọgbụgba ndụ ahụ, na-enweghị olileanya na-enweghịkwa Chineke nʼime ụwa.

13Ma ugbu a nʼime Kraịst Jisọs, unu bụ ndị nọ nʼebe dị anya nʼoge gara aga, ka e mere ka unu bịaruo nso site nʼọbara Kraịst nke a wụsiri.

14Nʼihi na ya onwe ya bụ udo anyị, o mere ka ụzọ otu abụọ bụrụ otu ihe nʼime ahụ ya, site na ịkwatu mgbidi kewara ha na mgbe ochie, bụ mgbidi nke ịkpọ asị dị nʼetiti anyị.

15Ọ bụ nʼime anụ ahụ ya ka ọ mere ka iwu ahụ na ụkpụrụ ya niile ghara ịdị ire. Ebumnobi ya bụ i kee nʼime onwe ya otu onye ọhụrụ site na mmadụ abụọ ahụ, si otu a mee ka udo dịrị.

16Nʼụzọ dị otu a ka ọ ga-esi kpeziere anyị na Chineke site nʼobe ya, wetakwa nʼisi ngwụcha, iro dị nʼetiti ha abụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.