1Ụmụ, ruberenụ ndị mụrụ unu isi nʼihi na nke a ziri ezi nʼime Onyenwe anyị.
2“Sọpụrụ nne gị na nna gị,” nʼihi na nke a bụ iwu mbụ nke nwere nkwa so ya.
3“Ka ihe nwe ike na-agara gị nke ọma, ka ị biekwa ogologo ndụ nʼelu ụwa.”
4Ndị bụ nna, unu akpasukwala ụmụ unu iwe kama zụlitenụ ha nʼọzụzụ na nʼozizi nke Onyenwe anyị.