Ndị Efesọs 6

“Ka ihe nwe ike na-agara gị nke ọma, ka ị biekwa ogologo ndụ nʼelu ụwa.”

Ephesians 6:3 (UKJV) That it may be well with you, and you may live long on the earth.

1Ụmụ, ruberenụ ndị mụrụ unu isi nʼihi na nke a ziri ezi nʼime Onyenwe anyị.

2“Sọpụrụ nne gị na nna gị,” nʼihi na nke a bụ iwu mbụ nke nwere nkwa so ya.

3“Ka ihe nwe ike na-agara gị nke ọma, ka ị biekwa ogologo ndụ nʼelu ụwa.”

4Ndị bụ nna, unu akpasukwala ụmụ unu iwe kama zụlitenụ ha nʼọzụzụ na nʼozizi nke Onyenwe anyị.

5Ndị bụ ohu ruberenụ ndị nwee unu isi. Jirinụ nsọpụrụ na egwu na obi ọcha jeere ha ozi dị ka a ga-asị na ọ bụ Kraịst ka unu na-ejere ozi ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.