Ndị Efesọs 6

Ndị bụ nna, unu akpasukwala ụmụ unu iwe kama zụlitenụ ha nʼọzụzụ na nʼozizi nke Onyenwe anyị.

Ephesians 6:4 (UKJV) And, all of you fathers, provoke not your children to wrath: but bring them up in the nurture and admonition of the Lord.

2“Sọpụrụ nne gị na nna gị,” nʼihi na nke a bụ iwu mbụ nke nwere nkwa so ya.

3“Ka ihe nwe ike na-agara gị nke ọma, ka ị biekwa ogologo ndụ nʼelu ụwa.”

4Ndị bụ nna, unu akpasukwala ụmụ unu iwe kama zụlitenụ ha nʼọzụzụ na nʼozizi nke Onyenwe anyị.

5Ndị bụ ohu ruberenụ ndị nwee unu isi. Jirinụ nsọpụrụ na egwu na obi ọcha jeere ha ozi dị ka a ga-asị na ọ bụ Kraịst ka unu na-ejere ozi ahụ.

6Ruberenụ ha isi, ọ bụghị naanị ka unu nata ihuọma ha mgbe ha nọ na-ele unu anya, kama dị ka ndị ohu Kraịst, ndị na-eme uche Chineke site nʼobi ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.