1Nke a bụ ihe mere nʼoge ọchịchị eze Sekses, bụ Sekses nke chiri alaeze nwere mpaghara dị iche iche nke karịrị otu narị na iri abụọ na asaa (127), nke gbasakwara site nʼIndia rụọ Kush.
2Nʼoge ahụ, isi ọchịchị obodo eze Sekses bụ Susa ebe ocheeze ya dịkwa.
3Nʼafọ nke atọ nke ọchịchị ya, o mere mmemme oke oriri nye ndịisi ọrụ ya niile. Ndị ọzọ ọ kpọkwara bụ ndịisi agha nke Peshịa na Midia, na ụmụ eze, na ndị ọchịchị sitere na mba dị iche iche ọ na-achị.
4Mmemme a were otu narị na iri ụbọchị asatọ (180). Eze jikwa oge a gosi akụnụba, na ịma mma na ebube nke alaeze ya.
5Mgbe ụbọchị ndị a gafesịrị, eze kpọrọ oke oriri nọrọ ụbọchị asaa nʼubi a gbara ogige dị nʼụlọeze, nye ndị niile nọ na Susa, site nʼonye ukwu ruo nʼonye nta.