1Nʼabalị ahụ, ụra abịaghị eze nʼanya ma ọlị. Nʼihi ya, o metụrụ ya nʼobi ịgụ akwụkwọ ihe ncheta. Ya mere, o nyere iwu ka e wetara ya akwụkwọ a na-edekọta ihe niile e mere nʼoge ọchịchị ya.
2Nʼime ya, ọ gụtara ihe e dere banyere Mọdekai, otu o si kpughee izuzu ọjọọ Bigtan na Teresh, ndị onozi eze na-eche nche nʼọnụ ụzọ ụlọeze, gbara igbu eze Sekses.
3Mgbe ahụ eze jụrụ ajụjụ sị, “Gịnị bụ ihe ọma e meerela Mọdekai nʼihi ihe a o mere?” Ndị ozi ya zara, “O nwebeghị ihe ọbụla e meere ya!”
4Eze sịrị, “Onye nọ nʼogige?” Ma Heman ka batachara na mbata ogige ụlọeze, ịgwa eze banyere mkwugbu Mọdekai nʼelu osisi nke o guzobere nʼihi ya.
5Ndị na-ejere ya ozi zara, “Heman na-eguzo nʼogige.” Eze sịrị, “Kpọbata ya.”