3Mgbe ahụ eze jụrụ ajụjụ sị, “Gịnị bụ ihe ọma e meerela Mọdekai nʼihi ihe a o mere?” Ndị ozi ya zara, “O nwebeghị ihe ọbụla e meere ya!”
4Eze sịrị, “Onye nọ nʼogige?” Ma Heman ka batachara na mbata ogige ụlọeze, ịgwa eze banyere mkwugbu Mọdekai nʼelu osisi nke o guzobere nʼihi ya.
5Ndị na-ejere ya ozi zara, “Heman na-eguzo nʼogige.” Eze sịrị, “Kpọbata ya.”
6Mgbe Heman batara, eze jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ ugwu m kwesiri inye onye mere ihe na-atọ m ụtọ?” Heman chere nʼime onwe ya sị, “Oleekwanụ onye ọzọ eze ga-achọ inye ugwu karịa mụ onwe m?”
7Ya mere ọ zara eze, “Banyere nwoke ahụ ọ masịrị eze ịkwanyere ugwu,