12Ụbọchị a akara aka maka ndị Juu ime ihe ndị a nʼobodo niile nʼalaeze eze Ahasuerọs bụ nʼabalị iri na atọ nke ọnwa Ada.
13E kwukwara nʼakwụkwọ iwu ahụ na a ghaghị ịnabata iwu eze ahụ nʼobodo ọbụla dị nʼalaeze ya. E kwukwara na a ga-agụpụtara ya mmadụ niile, kọwazie ya ime ka ndị Juu niile nọdụ na njikere imeri ndị iro ha.
14Ndị ahụ na-agba ọsọ, bụ ndị na-ebu akwụkwọ ozi, nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya eze mee ngwangwa pụọ, ebe iwu eze kwaliri ha. E nyekwara iwu a na Susa.
15Mgbe Mọdekai si nʼihu eze pụọ, o yi uwe ndị eze nke na-acha ọcha, na nke na-achakwa anụnụ anụnụ, kpurukwa okpueze ọlaedo dị ukwuu, na uwe mwụda e ji ezi akwa nke na-acha odo odo dụọ nʼahụ ya. Obodo Susa tiri mkpu ṅụrịakwa ọṅụ.
16Nye ndị Juu nʼonwe ha, ọ bụ oge ịṅụrị ọnụ, obi ụtọ na nsọpụrụ.