Esta 8

Mgbe Mọdekai si nʼihu eze pụọ, o yi uwe ndị eze nke na-acha ọcha, na nke na-achakwa anụnụ anụnụ, kpurukwa okpueze ọlaedo dị ukwuu, na uwe mwụda e ji ezi akwa nke na-acha odo odo dụọ nʼahụ ya. Obodo Susa tiri mkpu ṅụrịakwa ọṅụ.

Esther 8:15 (UKJV) And Mordecai went out from the presence of the king in royal apparel of blue and white, and with a great crown of gold, and with a garment of fine linen and purple: and the city of Shushan rejoiced and was glad.

13E kwukwara nʼakwụkwọ iwu ahụ na a ghaghị ịnabata iwu eze ahụ nʼobodo ọbụla dị nʼalaeze ya. E kwukwara na a ga-agụpụtara ya mmadụ niile, kọwazie ya ime ka ndị Juu niile nọdụ na njikere imeri ndị iro ha.

14Ndị ahụ na-agba ọsọ, bụ ndị na-ebu akwụkwọ ozi, nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya eze mee ngwangwa pụọ, ebe iwu eze kwaliri ha. E nyekwara iwu a na Susa.

15Mgbe Mọdekai si nʼihu eze pụọ, o yi uwe ndị eze nke na-acha ọcha, na nke na-achakwa anụnụ anụnụ, kpurukwa okpueze ọlaedo dị ukwuu, na uwe mwụda e ji ezi akwa nke na-acha odo odo dụọ nʼahụ ya. Obodo Susa tiri mkpu ṅụrịakwa ọṅụ.

16Nye ndị Juu nʼonwe ha, ọ bụ oge ịṅụrị ọnụ, obi ụtọ na nsọpụrụ.

17Na mpaghara alaeze ahụ niile, na nʼobodo ọbụla nke iwu eze ahụ bịaruru, e nwere ọṅụ na obi ụtọ nʼetiti ndị Juu niile, nweekwa oke oriri na ọṅụṅụ. Ọtụtụ mmadụ nʼime ndị si mba dị iche iche ghọrọ ndị Juu, nʼihi egwu ndị Juu dakwasịrị ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.