Esta 8

Ọzọkwa, Esta bịara nʼihu eze daa nʼala nʼụkwụ eze rịọ ya arịrịọ nʼanya mmiri ka ọ kwụsị echiche ọjọọ ahụ Heman onye Agag, chere megide ndị Juu.

Esther 8:3 (UKJV) And Esther spoke yet again before the king, and fell down at his feet, and besought him with tears to put away the mischief of Haman the Agagite, and his device that he had devised against the Jews.

1Nʼotu ụbọchị ahụ, Ahasuerọs bụ eze, nyefere Esta nwunye eze akụnụba niile Heman onye iro ndị Juu nwere. E mekwara ka Mọdekai bịa nʼihu eze, nʼihi na Esta agwala eze na ọ bụ nwanne nna ya.

2Mgbe ahụ, eze wepụtara ọlaaka ikike ya, nke a gbapụtara site nʼaka Heman nye ya Mọdekai. Esta mekwara Mọdekai onye nlekọta akụnụba Heman.

3Ọzọkwa, Esta bịara nʼihu eze daa nʼala nʼụkwụ eze rịọ ya arịrịọ nʼanya mmiri ka ọ kwụsị echiche ọjọọ ahụ Heman onye Agag, chere megide ndị Juu.

4Eze setịpụrụ mkpara ọlaedo ya nye Esta. Esta biliri, guzo nʼihu eze,

5ọ sịrị, “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ọ bụrụkwa na m hụtara amara nʼihu ya, bụrụkwa ihe ziri ezi nʼanya eze, ọ bụrụkwa na ihe m masịrị ya, ka ede iwu nʼakwụkwọ ịkagbu ozi Heman nwa Hamedata, onye Agag, nke o chepụtara dee ime ka a laa ndị Juu nʼiyi nʼala niile eze na-achị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.