Esta 8

ọ sịrị, “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ọ bụrụkwa na m hụtara amara nʼihu ya, bụrụkwa ihe ziri ezi nʼanya eze, ọ bụrụkwa na ihe m masịrị ya, ka ede iwu nʼakwụkwọ ịkagbu ozi Heman nwa Hamedata, onye Agag, nke o chepụtara dee ime ka a laa ndị Juu nʼiyi nʼala niile eze na-achị.

Esther 8:5 (UKJV) And said, If it please the king, and if I have favour in his sight, and the thing seem right before the king, and I be pleasing in his eyes, let it be written to reverse the letters devised by Haman the son of Hammedatha the Agagite, which he wrote to destroy the Jews which are in all the king's provinces:

3Ọzọkwa, Esta bịara nʼihu eze daa nʼala nʼụkwụ eze rịọ ya arịrịọ nʼanya mmiri ka ọ kwụsị echiche ọjọọ ahụ Heman onye Agag, chere megide ndị Juu.

4Eze setịpụrụ mkpara ọlaedo ya nye Esta. Esta biliri, guzo nʼihu eze,

5ọ sịrị, “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ọ bụrụkwa na m hụtara amara nʼihu ya, bụrụkwa ihe ziri ezi nʼanya eze, ọ bụrụkwa na ihe m masịrị ya, ka ede iwu nʼakwụkwọ ịkagbu ozi Heman nwa Hamedata, onye Agag, nke o chepụtara dee ime ka a laa ndị Juu nʼiyi nʼala niile eze na-achị.

6Nʼihi na m ga-esi aṅaa nagide ya, ịhụ ka a na-egbu ndị m, na-alakwa ụmụnna m nʼiyi?”

7Mgbe ahụ, eze bụ Ahasuerọs gwara Esta nwunye eze na Mọdekai onye Juu okwu sị ha, “Enyela m Esta akụnụba Heman, ha akwụgbukwaala Heman nʼosisi, nʼihi na ọ chọrọ ịla ndị Juu nʼiyi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.