Esta 8

Mgbe ahụ, eze bụ Ahasuerọs gwara Esta nwunye eze na Mọdekai onye Juu okwu sị ha, “Enyela m Esta akụnụba Heman, ha akwụgbukwaala Heman nʼosisi, nʼihi na ọ chọrọ ịla ndị Juu nʼiyi.

Esther 8:7 (UKJV) Then the king Ahasuerus said unto Esther the queen and to Mordecai the Jew, Behold, I have given Esther the house of Haman, and him they have hanged upon the gallows, because he laid his hand upon the Jews.

5ọ sịrị, “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ọ bụrụkwa na m hụtara amara nʼihu ya, bụrụkwa ihe ziri ezi nʼanya eze, ọ bụrụkwa na ihe m masịrị ya, ka ede iwu nʼakwụkwọ ịkagbu ozi Heman nwa Hamedata, onye Agag, nke o chepụtara dee ime ka a laa ndị Juu nʼiyi nʼala niile eze na-achị.

6Nʼihi na m ga-esi aṅaa nagide ya, ịhụ ka a na-egbu ndị m, na-alakwa ụmụnna m nʼiyi?”

7Mgbe ahụ, eze bụ Ahasuerọs gwara Esta nwunye eze na Mọdekai onye Juu okwu sị ha, “Enyela m Esta akụnụba Heman, ha akwụgbukwaala Heman nʼosisi, nʼihi na ọ chọrọ ịla ndị Juu nʼiyi.

8Ugbu a, deenụ akwụkwọ ozi banyere ndị Juu niile, dee ihe ọbụla dị mma nʼanya unu nʼaha eze. Werekwa ọlaaka ikike eze kaa ya akara, nʼihi na ọ dịghị akwụkwọ ọbụla e dere nʼaha eze, kaakwa ya akara mgbaaka eze nke a pụrụ imegharị.”

9Otu mgbe ahụ, akpọrọ ndị ode akwụkwọ eze. Ọ bụ nʼiri abalị na atọ nke ọnwa atọ nʼafọ nke bụ ọnwa Sivan ka ihe ndị a mere. Ha dere iwu niile Mọdekai nyere banyere ndị Juu, ndịisi ọchịchị niile na ndị ọchịchị niile na-elekọta mpaghara alaeze niile site nʼIndia ruo Kush. Ọnụọgụgụ ha niile dị otu narị na iri abụọ na asaa (127). E depụtasịrị iwu ahụ nʼodide akwụkwọ nke ala ọbụla a na-achị achị si dị, na dịka asụsụ ndị ọbụla si dị, ma nyekwa ndị Juu dịka odide akwụkwọ na asụsụ ha si dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.