2Mgbe ahụ, eze wepụtara ọlaaka ikike ya, nke a gbapụtara site nʼaka Heman nye ya Mọdekai. Esta mekwara Mọdekai onye nlekọta akụnụba Heman.
3Ọzọkwa, Esta bịara nʼihu eze daa nʼala nʼụkwụ eze rịọ ya arịrịọ nʼanya mmiri ka ọ kwụsị echiche ọjọọ ahụ Heman onye Agag, chere megide ndị Juu.
4Eze setịpụrụ mkpara ọlaedo ya nye Esta. Esta biliri, guzo nʼihu eze,
5ọ sịrị, “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ọ bụrụkwa na m hụtara amara nʼihu ya, bụrụkwa ihe ziri ezi nʼanya eze, ọ bụrụkwa na ihe m masịrị ya, ka ede iwu nʼakwụkwọ ịkagbu ozi Heman nwa Hamedata, onye Agag, nke o chepụtara dee ime ka a laa ndị Juu nʼiyi nʼala niile eze na-achị.
6Nʼihi na m ga-esi aṅaa nagide ya, ịhụ ka a na-egbu ndị m, na-alakwa ụmụnna m nʼiyi?”