17E mere ihe ndị a nʼabalị iri na atọ nke ọnwa Ada, ha zukwara ike nʼụbọchị so ya bụ abalị iri na anọ. Ha mere ụbọchị ahụ, ụbọchị ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ.
18Ma ndị Juu nọ na Susa zukọtara nʼụbọchị nke iri na atọ, na nʼụbọchị nke iri na anọ. Emesịa, nʼụbọchị nke iri na ise ha zuru ike, mekwa ya ụbọchị ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ.
19Ọ bụ nke a mere ndị Juu niile bi nʼime ime obodo ji eme mmemme ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ nʼabalị iri na anọ nke ọnwa iri na abụọ nke afọ ọbụla. Ha mere ụbọchị ahụ ka ọ bụrụkwa ụbọchị inyerịta onyinye.
20Emesịa, Mọdekai dere ihe ndị a niile nʼakwụkwọ, zigakwara ndị Juu niile nọ nʼokpuru ọchịchị eze Sekses, ma ndị nọ nso ma ndị nọ nʼebe dị anya,
21ka ha na-eme mmemme a kwa afọ nʼụbọchị nke iri na anọ na nke iri na ise nke ọnwa Ada ọbụla.