14“Ụbọchị a ga-abụrụ unu ihe ncheta nye ọgbọ niile ndị na-eso nʼazụ. Unu ga-emekwa ya ka ọ bụrụ mmemme nye Onyenwe anyị. Ụkpụrụ nke na-adịgide adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
15Ụbọchị asaa ka unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko. Nʼụbọchị mbụ nke ụbọchị asaa ahụ, ka unu ga-esite nʼụlọ unu wezuga ihe iko achịcha niile, nʼihi na onye ọbụla riri nri nke ihe na-eko achịcha dị nʼime ya site nʼụbọchị mbụ ruo nʼụbọchị nke asaa, aghaghị ibipụ ya site nʼala Izrel.
16Unu ga-ewere ụbọchị mbụ na ụbọchị nke asaa, nke mmemme ahụ, nwee mkpọkọta dị nsọ. Onye ọbụla agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị abụọ ndị a, karịakwa isi nri unu ga-eri.
17“Unu ga-edobekwa mmemme achịcha na-ekoghị eko nʼihi na ọ bụ nʼime otu ụbọchị a ka m sitere nʼala Ijipt kpọpụta unu dịka usuu ndị agha. Unu ga-emekwa mmemme ụbọchị a ka ọ bụrụ ụkpụrụ nke na-adịgide adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ
18Nʼọnwa mbụ, nʼanyasị nke ụbọchị nke iri na anọ, ka unu ga-eri achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee ruo nʼanyasị nke ụbọchị iri abụọ na otu.