27Unu ga-azaghachi ha sị, ‘Ọ bụ aja ngabiga anyị na-achụrụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ gafere ụlọ ụmụ Izrel nʼala Ijipt, mgbe o gburu ndị Ijipt, ma o nweghị onye ọbụla nʼime anyị o gburu.’ ”
28Ụmụ Izrel mezuru ihe niile Onyenwe anyị gwara ha site nʼọnụ Mosis na Erọn.
29Nʼime etiti abalị ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị gburu ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, malite nʼọkpara Fero onye nọ nʼocheeze ya, ruo nʼọkpara nke onye Ijipt nọ nʼụlọ mkpọrọ olulu. O gbukwara ụmụ anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ.
30Nʼabalị ahụ kwa, Fero na ndị ozi ya, na ndị Ijipt niile biliri. Oke iti mkpu akwa dakwara nʼala Ijipt, nʼihi na ọ dịghị ezinaụlọ ọnwụ na-erughị.
31Nʼotu abalị ahụ, Fero zipụrụ ozi ka a kpọ Mosis na Erọn. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha sị, “Ngwa bilienụ, unu bụ ụmụ Izrel niile. Kewapụnụ onwe unu site nʼetiti anyị. Gaanụ, fee Onyenwe anyị unu ofufe dịka unu rịọrọ.