Ọpụpụ 12

Ohu ọbụla a kwụrụ ụgwọ nʼisi ya ga-eri ya naanị ma e biri ya ugwu.

Exodus 12:44 (UKJV) But every man's servant that is bought for money, when you have circumcised him, then shall he eat thereof.

42Onyenwe anyị chere nche nʼabalị ụbọchị ahụ maka ịkpọpụta ha site nʼala Ijipt. Nʼihi ya, abalị ụbọchị ahụ bụ mgbe pụrụ iche nye ụmụ Izrel maka iji iche nche sọpụrụ Onyenwe anyị nʼọgbọ ha niile.

43Onyenwe anyị kpọrọ Mosis na Erọn gwa ha sị, “Ndị a bụ usoro iwu metụtara Mmemme Ngabiga: “Onye mba ọzọ agaghị eri anụ nwa atụrụ ahụ.

44Ohu ọbụla a kwụrụ ụgwọ nʼisi ya ga-eri ya naanị ma e biri ya ugwu.

45Ohu e goro ọrụ, maọbụ onye ọbịa ọbụla agaghị eri ya.

46“A ga-eri ya naanị nʼime otu ụlọ. Ọ gaghị apụ nʼezi. Unu agaghị atapịa ọkpụkpụ ọbụla nke nwa atụrụ ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.