Ọpụpụ 12

Ohu e goro ọrụ, maọbụ onye ọbịa ọbụla agaghị eri ya.

Exodus 12:45 (UKJV) A foreigner and an hired servant shall not eat thereof.

43Onyenwe anyị kpọrọ Mosis na Erọn gwa ha sị, “Ndị a bụ usoro iwu metụtara Mmemme Ngabiga: “Onye mba ọzọ agaghị eri anụ nwa atụrụ ahụ.

44Ohu ọbụla a kwụrụ ụgwọ nʼisi ya ga-eri ya naanị ma e biri ya ugwu.

45Ohu e goro ọrụ, maọbụ onye ọbịa ọbụla agaghị eri ya.

46“A ga-eri ya naanị nʼime otu ụlọ. Ọ gaghị apụ nʼezi. Unu agaghị atapịa ọkpụkpụ ọbụla nke nwa atụrụ ahụ.

47Nzukọ niile nke ụmụ Izrel ga-eme Mmemme Ngabiga a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.