Ọpụpụ 13

Mosis buuru ọkpụkpụ Josef mgbe ha na-ala. Nʼihi na o mere ka ụmụ Izrel ṅụọ iyi na ha ga-eme otu a, na-asị, “Chineke ga-eleta unu nʼezie, mgbe ahụ, unu aghaghị iburu ọkpụkpụ m si nʼebe a pụọ.”

Exodus 13:19 (UKJV) And Moses took the bones of Joseph with him: for he had strictly sworn the children of Israel, saying, God will surely visit you; and all of you shall carry up my bones away behind with you.

17Mgbe Fero mesịrị kwere ka ụmụ Izrel laa, Chineke edughị ha site nʼụzọ ahụ gafere ala ndị Filistia. Ọ bụ ezie na ụzọ ahụ dị nso karịa. Chineke mere nke a nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Ọ bụrụ na ndị a ezute agha, ha nwere ike ịgbanwe obi ha tụgharịa ịlaghachi azụ nʼIjipt.”

18Ya mere, Chineke duuru ha ga nʼụzọ Osimiri Uhie, nke gara nʼụzọ nke ọzara. Ụmụ Izrel kwadokwara akwado ibu agha mgbe ha si nʼala Ijipt pụọ.

19Mosis buuru ọkpụkpụ Josef mgbe ha na-ala. Nʼihi na o mere ka ụmụ Izrel ṅụọ iyi na ha ga-eme otu a, na-asị, “Chineke ga-eleta unu nʼezie, mgbe ahụ, unu aghaghị iburu ọkpụkpụ m si nʼebe a pụọ.”

20Ha si Sukọt bilie ije, maa ụlọ ikwu ha na Etam, na nsọtụ ọzara.

21Onyenwe anyị ji ogidi igwe ojii na-eje nʼihu ha nʼehihie, idu ha nʼụzọ ha niile. Nʼabalị, o ji ogidi ọkụ, inye ha ìhè ka ha nwee ike ịga njem nʼehihie nakwa nʼabalị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.