18Ya mere, Chineke duuru ha ga nʼụzọ Osimiri Uhie, nke gara nʼụzọ nke ọzara. Ụmụ Izrel kwadokwara akwado ibu agha mgbe ha si nʼala Ijipt pụọ.
19Mosis buuru ọkpụkpụ Josef mgbe ha na-ala. Nʼihi na o mere ka ụmụ Izrel ṅụọ iyi na ha ga-eme otu a, na-asị, “Chineke ga-eleta unu nʼezie, mgbe ahụ, unu aghaghị iburu ọkpụkpụ m si nʼebe a pụọ.”
20Ha si Sukọt bilie ije, maa ụlọ ikwu ha na Etam, na nsọtụ ọzara.
21Onyenwe anyị ji ogidi igwe ojii na-eje nʼihu ha nʼehihie, idu ha nʼụzọ ha niile. Nʼabalị, o ji ogidi ọkụ, inye ha ìhè ka ha nwee ike ịga njem nʼehihie nakwa nʼabalị.
22Ma ogidi igwe ojii nʼehihie na ogidi ọkụ ahụ nʼabalị, ọ dịghị nke hapụrụ ọnọdụ ya nʼihu ha.