13Mosis zaghachiri ha sị, “Unu atụla egwu. Guzosienụ ike. Unu ga-ahụ ụzọ dị ebube Onyenwe anyị ga-esi zọpụta unu taa. Ndị Ijipt a unu na-ahụ taa, unu agaghị ahụkwa ha ọzọ.
14Nọrọnụ jii. Onyenwe anyị ga-alụrụ unu ọgụ.”
15Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Gịnị mere i ji na-akpọku m. Gwa ụmụ Izrel ka ha gaa nʼihu.
16Welie mkpanaka gị elu. Setịpụ ya nʼelu osimiri ahụ ka o kewaa abụọ. Ụzọ ga-adịkwa nʼetiti osimiri ahụ. Ụmụ Izrel ga-esitekwa nʼala akọrọ gafee.
17Aga m eme ka obi ndị Ijipt sie ike, ka ha sorokwa unu nʼazụ banye. Aga m ewetara onwe m otuto site na Fero, na ndị agha niile, na ụgbọ agha niile nakwa ndị na-agba ịnyịnya ya.