Ọpụpụ 14

Nke a mere ka ogidi igwe ojii ahụ dịrị nʼetiti ụmụ Izrel na ndị Ijipt. Nʼabalị ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị mere ka ogidi igwe ojii ahụ nye ụmụ Izrel ìhè, ma ndị Ijipt nọgidere nʼọchịchịrị. Otu a, ndị Ijipt enweghị ike bịarute nʼebe ụmụ Izrel nọ.

Exodus 14:20 (UKJV) And it came between the camp of the Egyptians and the camp of Israel; and it was a cloud and darkness to them, but it gave light by night to these: so that the one came not near the other all the night.

18Nʼoge ahụ, ndị Ijipt ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. M ga-enweta nsọpụrụ site na Fero, na ụgbọ agha ya niile, na ndị na-agba ịnyịnya ya.”

19Mgbe ahụ, mmụọ ozi Chineke, onye na-aga nʼihu ndị agha Izrel, sitere nʼihu pụọ gaa nọdụ nʼazụ ha. Otu a kwa, ogidi igwe ojii ahụ sitere nʼihu gaa nʼazụ ha.

20Nke a mere ka ogidi igwe ojii ahụ dịrị nʼetiti ụmụ Izrel na ndị Ijipt. Nʼabalị ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị mere ka ogidi igwe ojii ahụ nye ụmụ Izrel ìhè, ma ndị Ijipt nọgidere nʼọchịchịrị. Otu a, ndị Ijipt enweghị ike bịarute nʼebe ụmụ Izrel nọ.

21Mgbe ahụ, Mosis setịpụrụ aka ya nʼelu Osimiri Uhie ahụ. Onyenwe anyị ji oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ, nke fere nʼabalị ahụ niile, nughachi osimiri ahụ, mee ka osimiri ahụ kebie ụzọ abụọ, ka ụzọ pụta nʼala osimiri ahụ.

22Ụmụ Izrel sitere nʼetiti osimiri ahụ gafee. Mmiri osimiri ahụ ghọọrọ mgbidi nʼaka nri ha ma nʼaka ekpe ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.