Ọpụpụ 14

Nʼoge ahụ, ndị Ijipt ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. M ga-enweta nsọpụrụ site na Fero, na ụgbọ agha ya niile, na ndị na-agba ịnyịnya ya.”

Exodus 14:18 (UKJV) And the Egyptians shall know that I am the LORD, when I have got me honour upon Pharaoh, upon his chariots, and upon his horsemen.

16Welie mkpanaka gị elu. Setịpụ ya nʼelu osimiri ahụ ka o kewaa abụọ. Ụzọ ga-adịkwa nʼetiti osimiri ahụ. Ụmụ Izrel ga-esitekwa nʼala akọrọ gafee.

17Aga m eme ka obi ndị Ijipt sie ike, ka ha sorokwa unu nʼazụ banye. Aga m ewetara onwe m otuto site na Fero, na ndị agha niile, na ụgbọ agha niile nakwa ndị na-agba ịnyịnya ya.

18Nʼoge ahụ, ndị Ijipt ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. M ga-enweta nsọpụrụ site na Fero, na ụgbọ agha ya niile, na ndị na-agba ịnyịnya ya.”

19Mgbe ahụ, mmụọ ozi Chineke, onye na-aga nʼihu ndị agha Izrel, sitere nʼihu pụọ gaa nọdụ nʼazụ ha. Otu a kwa, ogidi igwe ojii ahụ sitere nʼihu gaa nʼazụ ha.

20Nke a mere ka ogidi igwe ojii ahụ dịrị nʼetiti ụmụ Izrel na ndị Ijipt. Nʼabalị ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị mere ka ogidi igwe ojii ahụ nye ụmụ Izrel ìhè, ma ndị Ijipt nọgidere nʼọchịchịrị. Otu a, ndị Ijipt enweghị ike bịarute nʼebe ụmụ Izrel nọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.