Ọpụpụ 15

Nʼoge ahụ, Miriam onye amụma nwanyị, nwanne Erọn weere ịgba iti egwu nʼaka ya, duo ndị inyom ndị so ya, jiri ịgba egwu nke ha na-etekwa egwu.

Exodus 15:20 (UKJV) And Miriam the prophetess, the sister of Aaron, took a timbrel in her hand; and all the women went out after her with timbrels and with dances.

18“Onyenwe anyị ga-abụ eze ruo mgbe niile ebighị ebi.”

19Mgbe ịnyịnya Fero, na ụgbọ agha ya, na ndị na-agba ịnyịnya, gbabanyere nʼosimiri, Onyenwe anyị mere ka mgbidi mmiri ahụ dagbuo ha. Ma ụmụ Izrel sitere nʼala mmiri kọrọ gafee.

20Nʼoge ahụ, Miriam onye amụma nwanyị, nwanne Erọn weere ịgba iti egwu nʼaka ya, duo ndị inyom ndị so ya, jiri ịgba egwu nke ha na-etekwa egwu.

21Miriam bụrụ abụ sị ha, “Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na ọ bụ onye e buliri elu nke ukwu. Ịnyịnya na ndị na-agba ha, ka ọ tụnyere nʼime osimiri.”

22Mgbe ihe ndị a mesịrị, Mosis nọgidere na-edu ụmụ Izrel. Ha sitere nʼOsimiri Uhie ahụ bilie ije, jeruo ọzara Shua. Ha jere ije nʼime ọzara abalị atọ, ma ha achọtaghị mmiri ọṅụṅụ

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.