1Mgbe ahụ, Mosis na ụmụ Izrel bụkuru Onyenwe anyị abụ dị otu a sị, “Aga m abụku Onyenwe anyị abụ nʼihi na o buliela onwe ya elu nke ukwuu. Ọ tụnyela ịnyịnya na onye na-agba ya nʼosimiri.
2“Onyenwe anyị bụ ike m na abụ m. Ọ ghọrọla m nzọpụta. Ọ bụ Chineke m, aga m etokwa ya, Chineke nke nna m, aga m ebulikwa ya elu.
3Onye na-ebu agha ka Onyenwe anyị bụ. Nʼezie, aha ya bụ Onyenwe anyị.
4Ụgbọ agha Fero na usuu ndị agha ya, ka ọ tụnyere nʼosimiri ahụ. Ndịisi agha Fero, ndị ahọrọ ahọ, ka o mere ka Osimiri Uhie rie.
5Ogbu osimiri ahụ ekpuchiela ha. Nʼime mmiri ahụ dị omimi ka ha rịdaruru dịka nkume.