Ọpụpụ 15

Ogbu osimiri ahụ ekpuchiela ha. Nʼime mmiri ahụ dị omimi ka ha rịdaruru dịka nkume.

Exodus 15:5 (UKJV) The depths have covered them: they sank into the bottom as a stone.

3Onye na-ebu agha ka Onyenwe anyị bụ. Nʼezie, aha ya bụ Onyenwe anyị.

4Ụgbọ agha Fero na usuu ndị agha ya, ka ọ tụnyere nʼosimiri ahụ. Ndịisi agha Fero, ndị ahọrọ ahọ, ka o mere ka Osimiri Uhie rie.

5Ogbu osimiri ahụ ekpuchiela ha. Nʼime mmiri ahụ dị omimi ka ha rịdaruru dịka nkume.

6Aka nri gị Onyenwe anyị, dị ike, dịkwa ebube. Aka nri gị, Onyenwe anyị na-etipịasị ndị iro.

7“Nʼoke ike nke ịdị elu gị, Ị lụgbuola ndị niile na-ebili imegide gị. I zipụrụ iwe gị dị ọkụ, o repịara ha dịka igbugbo ọka.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.