Ọpụpụ 15

Aka nri gị Onyenwe anyị, dị ike, dịkwa ebube. Aka nri gị, Onyenwe anyị na-etipịasị ndị iro.

Exodus 15:6 (UKJV) Your right hand, O LORD, is become glorious in power: your right hand, O LORD, has dashed in pieces the enemy.

4Ụgbọ agha Fero na usuu ndị agha ya, ka ọ tụnyere nʼosimiri ahụ. Ndịisi agha Fero, ndị ahọrọ ahọ, ka o mere ka Osimiri Uhie rie.

5Ogbu osimiri ahụ ekpuchiela ha. Nʼime mmiri ahụ dị omimi ka ha rịdaruru dịka nkume.

6Aka nri gị Onyenwe anyị, dị ike, dịkwa ebube. Aka nri gị, Onyenwe anyị na-etipịasị ndị iro.

7“Nʼoke ike nke ịdị elu gị, Ị lụgbuola ndị niile na-ebili imegide gị. I zipụrụ iwe gị dị ọkụ, o repịara ha dịka igbugbo ọka.

8I sitere na nkuume nke oghere imi gị, mee ka mmiri osimiri guzoro ọtọ. Mmiri ahụ na-erugharị erugharị guzoro nʼotu ebe dịka mgbidi; ogbu mmiri kpụkọtara rahụ nʼala ala nsọtụ nke osimiri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.