Ọpụpụ 16

Mgbe ala kọrọ mmiri igirigi ahụ, ihe dịka achịcha mbadamba nta jupụtara nʼala ọzara ahụ niile.

Exodus 16:14 (UKJV) And when the dew that lay was gone up, behold, upon the face of the wilderness there lay a small round thing, as small as the hoar frost on the ground.

12“Anụla m ntamu nke ụmụ Izrel na-atamu. Gwa ha sị, ‘Nʼanyasị taa, unu ga-ata anụ, nʼụtụtụ echi unu ga-eri achịcha. Mgbe ahụ, unu ga-amata na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’ ”

13Nʼoge uhuruchi ụbọchị ahụ, nnụnụ kweel bịara kpuchie ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Nʼisi ụtụtụ echi ya, igirigi dakwara gburugburu ọmụma ụlọ ikwu ahụ.

14Mgbe ala kọrọ mmiri igirigi ahụ, ihe dịka achịcha mbadamba nta jupụtara nʼala ọzara ahụ niile.

15Mgbe ụmụ Izrel hụrụ ya, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nke a?” Mosis zaghachiri ha sị, “Ọ bụ achịcha Onyenwe anyị nyere unu ka unu rie.

16Ihe ndị a bụ iwu Onyenwe anyị nyere, ‘Ka onye ọbụla chịkọta naanị nke ọ ga-ericha. Ihe ọtụtụ ọmaa maka otu onye dịka ọnụọgụgụ ha si dị nʼezinaụlọ.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.