Ọpụpụ 16

Mgbe ụmụ Izrel hụrụ ya, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nke a?” Mosis zaghachiri ha sị, “Ọ bụ achịcha Onyenwe anyị nyere unu ka unu rie.

Exodus 16:15 (UKJV) And when the children of Israel saw it, they said one to another, It is manna: for they know not what it was. And Moses said unto them, This is the bread which the LORD has given you to eat.

13Nʼoge uhuruchi ụbọchị ahụ, nnụnụ kweel bịara kpuchie ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Nʼisi ụtụtụ echi ya, igirigi dakwara gburugburu ọmụma ụlọ ikwu ahụ.

14Mgbe ala kọrọ mmiri igirigi ahụ, ihe dịka achịcha mbadamba nta jupụtara nʼala ọzara ahụ niile.

15Mgbe ụmụ Izrel hụrụ ya, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nke a?” Mosis zaghachiri ha sị, “Ọ bụ achịcha Onyenwe anyị nyere unu ka unu rie.

16Ihe ndị a bụ iwu Onyenwe anyị nyere, ‘Ka onye ọbụla chịkọta naanị nke ọ ga-ericha. Ihe ọtụtụ ọmaa maka otu onye dịka ọnụọgụgụ ha si dị nʼezinaụlọ.’ ”

17Ụmụ Izrel mere dịka a gwara ha, ụfọdụ chịkọtara nke hiri nne, ụfọdụ nke dị nta.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.