Ọpụpụ 16

Ndị Izrel niile riri mánà ndị a iri afọ anọ tutu ruo mgbe ha batara nʼala ebe ndị mmadụ bi, tutu ruo mgbe ha bịarutere nʼoke ala Kenan.

Exodus 16:35 (UKJV) And the children of Israel did eat manna forty years, until they came to a land inhabited; they did eat manna, until they came unto the borders of the land of Canaan.

33Nʼihi nke a, Mosis nyere Erọn iwu sị ya, “Tụrụ ọtụtụ ọmaa mánà tinye ya nʼime ite nta. Bute ya debe ya nʼihu Onyenwe anyị, ka ọ bụrụ ihe ga-adịgide nye ọgbọ dị nʼihu.”

34Emesịa, Erọn dọnyere mánà a nʼihu Ihe Ama e debere nʼime ụlọ ikwu, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.

35Ndị Izrel niile riri mánà ndị a iri afọ anọ tutu ruo mgbe ha batara nʼala ebe ndị mmadụ bi, tutu ruo mgbe ha bịarutere nʼoke ala Kenan.

36(Ihe ọtụtụ ọmaa bụ otu ọtụtụ nʼime ọtụtụ iri nke ga-eju ihe ọtụtụ efaf.)

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.