Ọpụpụ 17

Ma akpịrị mmiri kpọrọ ndị a nkụ nʼebe ahụ, nke a mere ka ha tamuo ntamu megide Mosis. Ha sịrị, “Ọ bụkwa nʼihi gịnị ka i ji site nʼobodo Ijipt kpọpụta anyị, ime ka anyị, ụmụntakịrị anyị na anụ ụlọ anyị nwụọ nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ?”

Exodus 17:3 (UKJV) And the people thirsted there for water; and the people murmured against Moses, and said, Wherefore is this that you have brought us up out of Egypt, to kill us and our children and our cattle with thirst?

1Ọgbakọ ụmụ Izrel niile sitere nʼọzara Sin bilie ije ha, na-aga site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu. Ha mara ụlọ ikwu ha na Refidim, ma ọ dịghị mmiri dị nke ndị mmadụ ga-aṅụ.

2Nʼihi nke a, ha sesịrị Mosis okwu, sị, “Nye anyị mmiri ka anyị ṅụọ.” Mosis zara, sị, “Gịnị mere unu ji esesị m okwu? Gịnị mere unu ji chọọ ịnwapụta ntachiobi Onyenwe anyị?”

3Ma akpịrị mmiri kpọrọ ndị a nkụ nʼebe ahụ, nke a mere ka ha tamuo ntamu megide Mosis. Ha sịrị, “Ọ bụkwa nʼihi gịnị ka i ji site nʼobodo Ijipt kpọpụta anyị, ime ka anyị, ụmụntakịrị anyị na anụ ụlọ anyị nwụọ nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ?”

4Nʼihi ya, Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa sị, “Gịnị ka m ga-eme banyere ndị a. Lee, ha chọrọ itugbu m na nkume.”

5Ma Onyenwe anyị zaghachiri Mosis, sị ya, “Gaa nʼihu ndị a, kpọrọ ụfọdụ nʼime ndị okenye Izrel. Jirikwa mkpanaka ahụ nʼaka gị, bụ nke i tiri nʼelu osimiri Naịl gaa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.