Ọpụpụ 17

Nʼihi ya, Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa sị, “Gịnị ka m ga-eme banyere ndị a. Lee, ha chọrọ itugbu m na nkume.”

Exodus 17:4 (UKJV) And Moses cried unto the LORD, saying, What shall I do unto this people? they be almost ready to stone me.

2Nʼihi nke a, ha sesịrị Mosis okwu, sị, “Nye anyị mmiri ka anyị ṅụọ.” Mosis zara, sị, “Gịnị mere unu ji esesị m okwu? Gịnị mere unu ji chọọ ịnwapụta ntachiobi Onyenwe anyị?”

3Ma akpịrị mmiri kpọrọ ndị a nkụ nʼebe ahụ, nke a mere ka ha tamuo ntamu megide Mosis. Ha sịrị, “Ọ bụkwa nʼihi gịnị ka i ji site nʼobodo Ijipt kpọpụta anyị, ime ka anyị, ụmụntakịrị anyị na anụ ụlọ anyị nwụọ nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ?”

4Nʼihi ya, Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa sị, “Gịnị ka m ga-eme banyere ndị a. Lee, ha chọrọ itugbu m na nkume.”

5Ma Onyenwe anyị zaghachiri Mosis, sị ya, “Gaa nʼihu ndị a, kpọrọ ụfọdụ nʼime ndị okenye Izrel. Jirikwa mkpanaka ahụ nʼaka gị, bụ nke i tiri nʼelu osimiri Naịl gaa.

6Lee, Aga m eguzo nʼihu gị nʼakụkụ nkume dị na Horeb. Ị ga-akụ mkpara gị nʼelu nkume ahụ. Mmiri ga-asọpụtakwa site na ya, ka ndị mmadụ ṅụọ.” Ya mere, Mosis mere otu a nʼihu ndị okenye Izrel niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.