Ọpụpụ 17

Lee, Aga m eguzo nʼihu gị nʼakụkụ nkume dị na Horeb. Ị ga-akụ mkpara gị nʼelu nkume ahụ. Mmiri ga-asọpụtakwa site na ya, ka ndị mmadụ ṅụọ.” Ya mere, Mosis mere otu a nʼihu ndị okenye Izrel niile.

Exodus 17:6 (UKJV) Behold, I will stand before you there upon the rock in Horeb; and you shall strike the rock, and there shall come water out of it, that the people may drink. And Moses did so in the sight of the elders of Israel.

4Nʼihi ya, Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa sị, “Gịnị ka m ga-eme banyere ndị a. Lee, ha chọrọ itugbu m na nkume.”

5Ma Onyenwe anyị zaghachiri Mosis, sị ya, “Gaa nʼihu ndị a, kpọrọ ụfọdụ nʼime ndị okenye Izrel. Jirikwa mkpanaka ahụ nʼaka gị, bụ nke i tiri nʼelu osimiri Naịl gaa.

6Lee, Aga m eguzo nʼihu gị nʼakụkụ nkume dị na Horeb. Ị ga-akụ mkpara gị nʼelu nkume ahụ. Mmiri ga-asọpụtakwa site na ya, ka ndị mmadụ ṅụọ.” Ya mere, Mosis mere otu a nʼihu ndị okenye Izrel niile.

7Nʼihi nke a, ọ kpọrọ aha ebe ahụ Masa na Meriba nʼihi esemokwu ụmụ Izrel na nʼihi nwale ha nwalere Onyenwe anyị, na-asị, “Onyenwe anyị ọ nọnyeere anyị, ka ọ bụ na ọ nọnyereghị anyị?”

8Ndị Amalek bịara lụso ụmụ Izrel agha na Refidim.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.