9Jetro soro Mosis ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu nʼihi ihe niile Onyenwe anyị meere ndị Izrel, na otu o siri napụta ha site nʼaka ndị Ijipt.
10Jetro kwuru sị, “Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ. Onye napụtara unu site nʼaka ndị Ijipt na site nʼaka Fero.
11Ugbu a, amaara m na Onyenwe anyị kachasị chi ndị ọzọ niile elu, nʼihi na ọ zọpụtara ndị ya site nʼaka ndị Ijipt ndị sitere na mpako ha meso Izrel mmeso.”
12Jetro, nna nwunye Mosis chụọrọ Chineke aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ. Emesịa, Erọn na ndị okenye Izrel bịara soro Mosis na ọgọ ya nwoke rie ihe nʼihu Chineke.
13Nʼụbọchị nke ọzọ ya, Mosis bịara nọdụ ala ikpere ndị mmadụ ikpe. Igwe mmadụ nọgidere Mosis site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị.