17Mgbe Jetro, nna nwunye Mosis, nụrụ ihe ndị a niile, ọ sịrị Mosis, “Ihe ị na-eme adịghị mma.
18Ike ga-agwụ gị, gwụkwa igwe mmadụ ndị a. Ọrụ a ị na-arụ dị ukwuu karịa gị. Naanị gị agaghị ebuli ya.
19Ugbu a, gee m ntị. M ga-adụ gị ọdụ, ka Chineke nọnyekwara gị. Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na ị bụ onye na-anọchi anya ndị a nʼihu Chineke. Nʼụzọ dị otu a, i nwere ike iweta nsogbu niile ha nwere nʼihu Chineke.
20Ihe ọzọ ị ga-eme bụ nke a: ị ga-akụziri ha iwu na ụkpụrụ Chineke, gosikwa ha ụzọ ha ga-esi bie ndụ, na ọrụ ha kwesiri ịrụ.
21Ma site nʼetiti ndị a họpụta ndị ikom tozuru, ndị ikom na-atụ egwu Chineke, ndị kwesiri ntụkwasị obi na ndị kpọrọ uru nʼezighị ezi asị. Mee ha ndịisi na-achị imerime puku ndị mmadụ, ndịisi narị mmadụ, ndịisi iri mmadụ ise na ndịisi mmadụ iri.